Ubochi taa
Anam ede nke a
I gwa gi otu ubochim siri ga
I maram ka onye na achi aturu
Marakwa na enweghim ihe niile ichoro
Ubochi niile anam akpahara ohia
Na acho ihe aturum ga eri
I mara na enweghi ihe na enyem
Obi uto karia ndu mkpachara anya
O bu nke a kam ji agwa gi,
I gwa gi otu ikem ha
Mana otu ihe m na ekwesi gi ike
Bu na m ga enye obi uto
M ga edu gi ga ebe di anya
Ebe nani mu na gi ga ebi
Ebe anyi ga agbanari anya ndi mmadu
Ebe anyi ga aku ubi ma rie ya
Anwu ga a cha n’iru anyi
Mmiri na asu asu ga abu mmanya anyi
Anu mfe na ndi bi n’ohia ga abu ihe nlere
Ma mgbe chi ga eji
Anyi ga edina, lekwasi kpakpando anya
Mu na gi ga ako akuko abali
Ma were obi uto hiri ura
Nke ka nke, obi uto gi ga abu uchem
********
Commentary:
The Igbo language is known to be blessed with a romantic heritage. The tribe is also known for their story telling and tradition. This piece highlights a lovers poetry, obviously the lover sees through the eyes of the poet. The Igbo is a proud African race and love to pronounce their love verbally and in action. There is an English version below.
Translation:
Today
I write this piece
To tell how my day went
You knew me as a shepherd
And knew that I have no wealth
All day I go in search of forage
For my flock
You know nothing brings me joy
Than a simple life
That is why I beseech you
See how far my strength can go!
I assure you
Unlimited happiness
I will take you to the farthest land
Where we can make our abode
Where we can live without human troubles
Where we can farm and feed
And where the sun will shine
The waterfalls will supply our drink
The birds and the wild will be our muse
And when the night shall fall
We lie down to stare at the stars
We shall tell many tales
Cuddle and sleep with happiness
To end, your happiness is my aim